Job 3

Okwu Job

1Nʼikpeazụ, onye kwuru okwu bụ Job nʼonwe ya. O kwuru okwu bụọ ụbọchị a mụrụ ya ọnụ. 2Job sịrị:

3“Ka ụbọchị ahụ amụrụ m bụrụ ụbọchị lara nʼiyi;
ya na abalị ahụ e kwuru sị, ‘Atụrụ ime nwa nwoke.’
4Ụbọchị ahụ, ka ọ ghọọ ọchịchịrị:
ka Chineke site nʼelu ghara ịjụ ase ya;
ka ìhè gharakwa ịmụkwasị ya.
5Ka ọchịchịrị na onyinyo ọnwụ gbara ụbọchị ahụ dịka ụbọchị nke aka ya,
ka igwe ojii kpuchigidekwa ya,
ka ọchịchịrị kpuchie ya nʼebe ọ dị ukwuu.
6Abalị ahụ, ka oke ọchịchịrị kpuchie ya,
ka a kachapụ ya, ka ọ hapụ ịbụkwa ụbọchị a ga-agụkọ ya na ụbọchị ndị ọzọ nʼafọ,
ka ọ ghara dịka otu ụbọchị nke na-adị nʼọnwa.
7Ka abalị ụbọchị ahụ bụrụ ụbọchị tọgbọrọ nʼefu,
ka a ghara ịnụ mkpu ọṅụ ọbụla nʼime ya.
8Ka ndị ahụ na-abụ ụbọchị ọnụ bụọ ụbọchị ahụ ọnụ,
bụ ndị ahụ jikeere ịkpọte Leviatan.
Anụ ọjọọ dị ukwuu bi nʼosimiri

9Ka kpakpando ụtụtụ ya gbaa ọchịchịrị,
ka o lee anya ìhè na-efu,
ka ọ ghara ihu mgbubere anya nke chi ọbụbọ,
10nʼihi na o mechighị akpanwa nne m,
i zonarịkwa anya m nsogbu.

11“Gịnị mere m ji hapụ ịnwụ mgbe ahụ nne m mụpụtara m,
kubie ume mgbe m si nʼime akpanwa pụta?
12Gịnị mere ikpere ji dịrị ịnabata m?
Gịnị mere ara ji dịrị i ji zụọ m?
13Nʼihi na ugbu a, agara m idina nʼudo;
agaara m anọ nʼụra na izuike,
14mụ na ndị eze na ndị ọchịchị nke ụwa,
ndị rụkwaara onwe ha ebe obibi dị iche iche nke tọgbọọrọ nʼefu ugbu a,
15mụ na ụmụ ndị ikom eze, ndị nwere ọlaedo,
ndị jikwa ọlaọcha kpojuo ụlọ ha.
16Ọ bụ gịnị mere e zofughị m nʼala dịka nwantakịrị a mụkworo amụkwo,
dịka nwa ọhụrụ nke na-ahụghị ìhè nke ụbọchị anya?
17Nʼebe ahụ ka ndị na-emebi iwu na-akwụsị iweta ọgbaaghara,
nʼebe ahụ ka ndị ike gwụrụ na-ezu ike.
18Ebe ahụ ka ndị nọ nʼagbụ na-enwere onwe ha,
ha adịghị anụkwa ịba mba nke ndị na-eji aka ike achị ha.
19Ebe ahụ ka ndị ukwu na ndị nta nọ;
ebe ahụ kwa ka ohu na-enwere onwe ya kpamkpam site nʼaka onye nwe ya.

20“Nʼihi gịnị ka e ji enye ndị nọ nʼọnọdụ nhụju anya ìhè?
Gịnị bụ uru ndụ nye onye mkpụrụobi ya jupụtara nʼihe ilu?
21Gịnị bụ uru ya nye ndị na-echere ọnwụ ma ọ dịghị abịa,
ee, ndị na-achọsi ọnwụ ike karịa akụ e zoro ezo,
22ndị jupụtara nʼọṅụ,
na-aṅụrị ọṅụ mgbe ha rịdaruru nʼili?
23Gịnị mere e ji enye mmadụ ndụ;
bụ onye ahụ ụzọ ya zoro ezo,
onye Chineke mechibidoro ụzọ?
24Nʼihi na ịma ọsụ aghọọla ihe oriri m kwa ụbọchị;
ịsụ ude m na-awụpụtakwa dịka mmiri.
25Ihe m tụrụ egwu ya abịakwasịla m,
ihe m tụrụ ụjọ ya bụ ihe bịakwasịrị m.
26Enweghị m udo, anọkwaghị m jụụ,
enweghị m izuike, naanị ọgbaaghara.”
Copyright information for IboBIU